2 Ndị Eze Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akụkọ a kọrọ nʼakwụkwọ a mezuru nʼala Izrel na Juda nʼime narị afọ abụọ na iri afọ ise. Nʼoge a, ụzọ oke ịla nʼiyi abụọ bịakwasịrị alaeze Izrel na nke Juda. Na mbụ, ndị Asịrịa bibiri ala Izrel bụ alaeze dị nʼakụkụ ugwu. Otu a kwa ndị Babilọn mesịrị bịa bibie ala Juda, bụ alaeze dị na ndịda. A kọrọ akụkọ ọchịchị ndị eze dị iche iche, ma ndị chịrị nʼIzrel, na ndị chịrị na Juda. A kọrọ akụkọ ndị eze ndị a igosi ụdị ọchịchị ha chịrị, ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Nʼime akụkọ ndị a niile e gosiri otu Chineke si nọgide na-arụ ọrụ ya, nʼoge agha, ma nʼoge udo; nʼoge iriju afọ, na nʼoge ụkọ; nʼoge ndị eze na-achịzi, na nʼoge ọchịchị ọjọọ. Chineke nọgidere nʼoge ndị a niile na-ezite ndị amụma ya ka ha kwusaa okwu ya, ma dọọ ndị mmadụ aka na ntị banyere ikpe ọmụma nke na-abịa.Usoro e si dee ya:Ọgwụgwụ oge ije ozi Ịlaịja 1:1–2:11

Ije ozi Ịlaisha 2:12–8:15

Ọchịchị ndị eze ruo na mbibi Izrel 8:16–17:41

Ọchịchị ndị eze ruo na mbibi Jerusalem 18–25

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help