Ndị Galeshịa Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ọ bụ Pọl kwusara oziọma mere ka e nwee nzukọ Kraịst nʼakụkụ Galeshịa. Ma mgbe ọ pụrụ gaa ikwusa oziọma nʼebe ọzọ ndị nkuzi ụgha bịakwutere ndị Galeshịa sị ha na o zughị oke bụ ikwere naanị na Kraịst, na ihe ọzọ fọdụrụ ha ga-eme tupu azọpụta ha. Ihe a ha ga-eme bụ idebezu iwu na omenaala ndị Juu. Pọl kwuru okwu megide ozizi ọjọọ a nʼakwụkwọ a. O gosiri na mgbaghara mmehie na nzọpụta na-adị naanị site nʼamara Chineke, nke na-erute onye ọbụla nwere okwukwe nʼime Kraịst.Usoro e si dee ya:Pọl akọwaa onwe ya, kọwaakwa oziọma 1–2Mnwere onwe site nʼibu ọnụ nke idebe iwu 3:1-22Izuoke nke oziọma 3:23–4:31Inwe onwe nke onye Kraịst 5Ibi ndụ nke onye Kraịst 6