1 Ndị Tesalonaịka Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Pọl kwusara oziọma nʼebe a ma nwee ụfọdụ ndị kweere na Kraịst. Ma mgbe Pọl si nʼetiti ha pụọ, ndị iro oziọma ahụ malitere ịkpagbu ha. Ma ha adaghị mba, kama ha nọgidesịrị ike. Nʼakwụkwọ a, Pọl na-agba ha ume. Ọ jara ha ike nʼihi iguzosi ike ha, kelee Chineke ekele nʼihe nchebe o chebere ha. O zikwara ha nʼakwụkwọ a banyere nlọghachi nke Kraịst ga-alọghachi, na olileanya dị oke ọnụahịa ndị niile kweere na Kraịst nwere.Usoro e si dee ya:Ekele mmalite 1Okwu Pọl kwuru banyere onwe ya 2–3Ndụmọdụ banyere ibi ezi ndụ 4:1-12Nlọghachi Kraịst 4:13–5:11Okwu mmechi 5:12-18