Zefanaya Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Zefanaya onye amụma buru amụma ya na Juda tupu ndị Babilọn adọta ndị bi nʼime ya nʼagha. Ọ rụrụ ọrụ ibu amụma na nkwusa ya nʼoge ọchịchị Josaya eze Juda. Eze Josaya gbalịrị idozi ihe ụfọdụ na-emebi emebi, ma ndị Juu bi nʼoge ahụ daghachiri azụ na-ebikwa ndụ ọjọọ ha. Ọ bụ nʼọnọdụ ndụ ọjọọ ha ka ndị Babilọn ji dọta Jerusalem nʼagha. Zefanaya gosiri na nkwusa ya na Chineke bụ onye ezi omume, gosikwa na ndị Juda, na obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ha megide Chineke.Usoro e si dee ya:Ọbịbịa nke ikpe ọmụma Chineke 1:1–2:3Ikpe ọmụma dịrị Jerusalem, na mba ndị ọzọ 2:4–3:8Ngọzị ga-emesịa dịrị Juda 3:9-20