Aịzaya 27 - Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbapụta dịrị Izrel

1Nʼụbọchị ahụ,

Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya

iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike,

taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ.

Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ;

ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.

2Nʼụbọchị ahụ,

abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.

3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya,

ana m agba ya mmiri ụbọchị niile,

na-eche ya nche ehihie na abalị.

Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.

4Adịghị m ewekwa iwe.

Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba,

aga m ebili buso ha agha,

aga m esurekwa ha ọkụ.

5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa,

ha bịa ka mụ na ha mee udo.

E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”

6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ.

Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru,

jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile.

7 Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ

dịka o si taa ndị iro ya.

O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya

dị ka e si gbuo ndị iro ha.

8 Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ.

Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ

ka o ji bupụ ha.

9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb,

nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya:

Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha

dịka ntụ,

mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera,

na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.

10Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala.

Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.

Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri,

ebe ha na-amakpu na-ezu ike.

Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.

11Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa,

ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ.

Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta.

Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere.

Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.

12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu.

13Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help