Abụ nke Abụ 4 - Igbo Contemporary Bible 2020

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

1Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya,

e, ị mara mma!

Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru.

Agịrị isi gị dị ka igwe ewu

nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead.

2Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ,

nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.

Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,

ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha.

3Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie.

Ọnụ gị dị mma ile anya.

Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị

dị ka pomegranet e kere abụọ.

4Olu gị dị ka ụlọ elu Devid,

nke e wuziri nke ọma.

E konyere puku ọta na ya,

ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha.

5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ,

nke otu nne mụrụ nʼotu oge,

ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.

6Tutu chi ụtụtụ abọọ,

tutu onyinyo agbalaga,

aga m aga nʼugwu ụda máá

na nʼugwu insensi.

7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya,

ọ dịkwaghị ntụpọ ọbụla dị gị nʼahụ.

8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ.

Si na Lebanọn bịa soro m;

rịdata site nʼugwu Amana,

nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon,

site nʼọgba ọdụm

nʼugwu niile ebe agụ bi.

9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m;

i riela m obi,

i werela ile anya gị

na ihe olu i yi rie obi m.

10Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.

Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya,

isisi ụtọ nke mmanụ otite gị

na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla.

11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m,

mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị,

isisi ụtọ nke uwe gị

na-esi ka Lebanọn

12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ.

Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.

13Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet

nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa,

nke nwere henna na naad,

14naad na safron,

kalamus na sinamọn,

na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,

na ụda máá, na aloos

na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ.

15I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige,

olulu mmiri dị ndụ

nke si na Lebanọn asọdata.Onye a hụrụ nʼanya

16Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu;

bịakwa gị ifufe si na ndịda,

fekwasị ubi m a gbara ogige,

ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile,

ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige,

ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help