2 Pita Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Nke a bụ akwụkwọ ikpeazụ Pita dere tupu e gbuo ya nʼihi okwukwe ya nʼime Kraịst. Ọ gwara ndị o deere akwụkwọ a na oziọma Kraịst bụ eziokwu. Ọ dọrọ ndị ozizi ụgha aka na ntị, kọwaa na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. O kwukwara okwu banyere ihe ga-eme mgbe ọgwụgwụ oge ruru, rịọsie ha arịrịọ ike sị ha too eto nʼamamihe na amara nke Chineke na-enye.Usoro e si dee ya:Ndụmọdụ banyere ito eto nʼime mmụọ 1Ịdọ aka na ntị banyere ozizi ụgha 2Ndụmọdụ banyere nlọghachi Kraịst 3