Ilu 11 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị

ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.

2Nganga bịa, nlelị a na-eso ya,

ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.

3Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha;

ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.

4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;

ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.

5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi,

ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.

6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya;

ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.

7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi,

ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.

8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha,

ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.

9Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya.

Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.

10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ,

otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.

11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu,

ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.

12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu;

ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.

13Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,

ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.

14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,

ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.

15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,

ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.

16Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,

ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.

17Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,

ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.

18Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,

ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.

19Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;

ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.

20 Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị

ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.

21Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,

ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.

22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,

dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.

23Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,

ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.

24Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,

ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.

25E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;

onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.

26Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ,

ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.

27Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma,

ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.

28Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada,

ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.

29Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe,

onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.

30Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ,

onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.

31Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a;

a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help