Abụ Ọma 13 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 13Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.Ekpere maka nnapụta

1Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị?

Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?

2Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba

nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m?

Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?

3Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m.

Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;

4mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,”

mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.

5Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ;

mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.

6Aga m abụku Onyenwe anyị abụ,

nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help