Hosiya 12 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku,

ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị.

Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba.

Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ,

ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt.

2 Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe.

Ọ ga-ata Jekọb ahụhụ dịka ụzọ ya si dị,

kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị.

3Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ.

Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba.

4E, ya na mmụọ ozi gbara mgba.

Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya.

Ọ hụrụ ya na Betel,

gwaakwa ya okwu,

5 Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile,

Onyenwe anyị bụ aha ya.

6Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị,

guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi,

na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile.

7Onye ahịa na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ na-erenye ndị mmadụ ahịa,

ọ hụrụ imegbu emegbu nʼanya.

8Ifrem kwuru,

“Abaala m ọgaranya! Abụrụla m onye nwere akụnụba dị ukwuu!

Ọ bụ ezie na m bụ onye nwere akụ dị ukwuu,

ma agaghị achọta njehie maọbụ mmehie ọbụla nʼime m.”

9“Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị,

onye si nʼIjipt kpọpụta unu.

Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ,

dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka.

10A gwara m ndị amụma,

ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche,

sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche.”

11Gilead ọ na-eme ajọ ihe?

Ndị ya bụ ndị efulefu.

Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal?

Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume,

nke dị nʼubi a kọrọ akọ.

12Jekọb gbalagara nʼala Aram;

Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye,

nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.

13Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel,

o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya.

14Ma Ifrem akpasuola iwe ilu nke ukwuu.

Onyenwe ya ga-awụkwasịkwa ya ikpe ọmụma.

Ọ ga-akwụghachi ya dịka nlelị ya si dị.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help