Abụ Ọma 27 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 27Abụ Ọma Devid.Abụ nke iguzosi ike

1 Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,

onye ka m ga-atụ egwu ya?

Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,

ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?

2Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha

ka ha ripịa anụ ahụ m,

ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị,

bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.

3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,

obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;

ọ bụladị na agha adaa imegide m,

nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.

4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,

nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;

ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị

ụbọchị niile nke ndụ m,

na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,

na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.

5Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,

ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;

ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;

ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.

6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu

karịa ndị iro m gbara m gburugburu;

aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;

aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.

7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.

Meere m ebere, zaa m.

8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!”

Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.

9Ezonarịla m ihu gị,

agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe;

nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m.

O Chineke, Onye nzọpụta m,

ahapụkwala m.

10Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m,

Onyenwe anyị ga-anabata m.

11Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị;

duo m nʼụzọ kwesiri

nʼihi ndị na-akpagbu m.

12Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha,

ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m,

ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.

13Olileanya m bụ nke a:

Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị

nʼala ndị dị ndụ.

14Chere Onyenwe anyị;

dịrị ike, nwekwaa ume,

ma chere Onyenwe anyị.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help