Abụ Ọma 87 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 87Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ.Abụ maka Zayọn

1Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;

2 Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya,

karịa ebe obibi niile nke Jekọb.

3Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị,

O obodo Chineke; Sela

4“Aga m agụnye Rehab na Babilọn,

dịka ndị na-asọpụrụ m,

aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush,

aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ”

5Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị,

“A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya,

ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”

6 Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ:

“A mụrụ onye a na Zayọn.”

7Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị,

“Isi iyi m niile dị na gị.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help