Esta Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akụkọ dị nʼakwụkwọ a bụ akụkọ gbasara otu nwaagbọghọ onye Juu aha ya bụ Esta, onye e mere ka ọ ghọọ nwunye Ahasuerọs eze ndị Peshịa. Ọ bụ akụkọ gbasara otu Esta si zọpụta ndị Juu ibe ya mgbe otu nwoke aha ya bụ Heman, onye na-adụ eze ahụ ọdụ, chọrọ ka e gbuchapụ ndị Juu. E mesịrị kwụgbuo Heman nʼihi nzube ọjọọ ya, ma ndị Juu sitere nʼihe mere nʼoge a malite mmemme a na-akpọ Purim.Usoro e si dee ya:Esta aghọọ nwunye eze 1–2Nzube ọjọọ Heman 3:1–4:3Nzube Esta ịzọpụta ndị Juu 4:4–7:10Nzọpụta ndị Juu na mmemme Purim 8:11–10:3