Abụ Ọma 54 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 54Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?”Ekpere maka nchebe

1O Chineke, jiri aha gị zọpụta m;

jirikwa ike gị kpepụta m.

2O Chineke, nụrụ ekpere m;

gee ntị nʼokwu ọnụ m.

3Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha;

ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m,

ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela

4Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;

onyenwe m bụ onye na-agba m ume.

5Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m;

nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.

6Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja;

O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.

7Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile,

ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help