1O Chineke, meere m ebere,
nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m;
ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m.
2Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m;
site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m.
3Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
4Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,
nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?
5Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi;
oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.
6Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha,
ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile,
dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.
7Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ;
o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala.
8Depụta akwa arịrị m;
chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị.
Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?
9Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka,
ndị iro m ga-agbaghachi azụ.
Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.
10Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya,
nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,
11nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
12O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị;
aga m ewetara gị onyinye ekele m niile.
13Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ,
ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke,
nʼìhè nke ndụ.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.