Maika 5 - Igbo Contemporary Bible 2020

Onyendu si Betlehem

1Ugbu a doo ndị agha gị nʼusoro, gị obodo nke usuu ndị agha,

nʼihi na e jirila mgbidi gbaa gị gburugburu ibuso gị agha.

Ha ga-eji mkpara

tie onyendu Izrel na nti.

2“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata,

ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile,

ma onye ahụ ga-achị Izrel

ga-esi na gị pụta,

bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie,

sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.”

3Ya mere, a ga-arara ha nye

tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya.

Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ

ga-alọghachikwuru ndị Izrel.

4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya,

site nʼike nke Onyenwe anyị,

na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya.

Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu,

nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.

Mgbapụta na Mbibi

5Ọ ga-abụkwa udo anyị.

Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike,

sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe,

anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa,

ọ bụladị ndịisi asatọ.

6Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa,

jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd.

Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ,

mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị,

ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.

7Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb

ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ,

dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa,

maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa,

nke na-adịghị ele anya mmadụ

maọbụ chere ụmụ mmadụ.

8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb

ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ

dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche,

e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ,

nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga,

ma o nweghị onye ga-anapụta ya.

9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya,

a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.

10“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,

“Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu,

kụjisiekwa ụgbọala unu niile.

11Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi,

dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike.

12Aga m ala mgbaasị unu nʼiyi,

unu agaghị enwekwa ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase.

13Aga m ala arụsị a pịrị apị unu niile nʼiyi,

ya na nkume nsọ ahụ niile dị nʼetiti unu.

Unu agakwaghị akpọ isiala nye

ihe unu ji aka unu kpụọ.

14Aga m ehopu ogidi arụsị niile nke dị nʼetiti unu,

mgbe m ga-akụdasị obodo unu niile

15Aga m esite nʼoke iwe m na ọnụma m bọọrọ onwe m ọbọ

nʼahụ mba niile ndị ahụ jụrụ irubere m isi.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help