Abụ nke Abụ Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ a kọrọ akụkọ gbasara ịhụnanya nke dị nʼetiti Solomọn na nwanyị onye Shulam. Ọ kọwara ihe bụ ọnọdụ a na-ahụ nʼetiti nwoke na nwanyị hụrụ onwe ha nʼanya; dị ka ụdị okwu dị iche iche ha na-agwarịta onwe ha, na ụdị ọṅụ na-eju ha obi mgbe ọbụla ha nọdụkọrọ nʼotu ebe, na ụdị agụ na-agụ ha ịhụ onye ha hụrụ nʼanya anya.Usoro e si dee ya:Agụụ ọ gụrụ nwanyị Shulam ịhụ Solomọn anya 1–2Nwanyị Shulam na ndị inyom Jerusalem 3Mbata Solomọn batara 4–6Nnọkọ Solomọn na nwanyị ọ hụrụ nʼanya 7–8