Zekaraya Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Zekaraya na Hegai rụkọrọ ọrụ ha nʼotu oge. Chineke zitere ya na Hegai ịgba ndị Juu si Babilọn lọta ume. Ụzọ ozi asatọ pụtara ihe nʼọhụ Zekaraya hụrụ dị nʼakwụkwọ a. Ozi ndị ọzọ dị iche iche Zekaraya si nʼaka Chineke nata dịkwa nʼime ya. Ozi dị nʼakwụkwọ a na-egosi na Chineke bụ Onyenwe mmadụ niile. Na ọ bụ ya na-echebe ndị ya, na-enye ha akụnụba, na ike, na amara. Ọ na-egosikwa na ihe kachasị mkpa bụ mmadụ ịmata Chineke, na Chineke chọkwara ka mmadụ mata ya, na ọ ga-eme ka mmadụ mata ya site na Kraịst ọ ga-ezite.Usoro e si dee ya:Nkọwa mmalite 1:1-6Ụzọ ozi asatọ 1:7–6:8Odudo nsọ e doro Joshua 6:9-15Ozi ndị ọzọ dị iche iche 7–10Ọbịbịa onye Nzọpụta 11–13Mmeri ebighị ebi nke onye Nzọpụta 14