Job 33 - Igbo Contemporary Bible 2020

1“Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m;

ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.

2Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu;

okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.

3Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;

egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.

4Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,

nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.

5Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;

jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.

6Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;

mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.

7Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,

ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.

8“Ma ị kwuola ya na ntị m,

anụrụ m okwu ndị ahụ niile,

9‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere;

adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.

10Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ;

ọ na-ahụta m dịka onye iro ya.

11Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ;

ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’

12“Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma,

nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.

13Gịnị mere i ji na-ekpesara ya

na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?

14Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,

ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.

15Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,

mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra,

mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.

16O nwere ike kwunye ha okwu na ntị

ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;

17ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,

ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,

18ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,

chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.

19“Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,

ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.

20Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,

ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.

21Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,

ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.

22Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,

ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.

23Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,

dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ,

onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,

24ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,

‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili;

achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.

25Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,

ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’

26Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,

ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,

ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.

27Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:

‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume,

ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;

28ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,

ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’

29“Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ

ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.

30Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,

ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.

31“Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m;

dere jii ka m kwuo okwu.

32Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m;

kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.

33Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị;

dere jii, ka m zi gị amamihe.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help