Maika 1 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem.

2Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile,

gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya

ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu,

bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.

Ikpe ọmụma dịrị Sameria na Izrel

3Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa.

Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa.

4Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya,

ndagwurugwu niile na-agbawa,

dịka abụba dị nso nʼọkụ,

dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata

5Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb,

nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel.

Gịnị bụ njehie Jekọb?

Ọ bụghị Sameria?

Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda?

Ọ bụghị Jerusalem?

6“Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe,

ebe a na-akụ osisi vaịnị.

Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu,

mekwaa ka ntọala ya pụta ihe.

7Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi;

onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ.

Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi.

Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a,

a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.”

Ịkwa akwa na iru ụjụ

8Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa.

Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa.

Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa,

tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.

9Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta,

o rutela na Juda.

O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m,

rukwaarị Jerusalem.

10Unu ekwutela okwu ya na Gat;

unu akwakwala akwa ọbụla.

Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu,

unu ndị Bet-Ofra.

11Gabiganụ nʼụzọ unu,

unu ndị bi na Shafia.

Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu,

unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso.

Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ

nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.

12Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu

na-eche ka ihe ọma bịa,

nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa,

ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem

13Unu ndị bi na Lakish

kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha.

Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere,

nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.

14Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye

mgbe unu na-agbapụ ọsọ.

Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ

nye ndị eze Izrel.

15Aga m akpọbata onye ga-emeri unu

ndị bi na Maresha nʼagha.

Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel

ga-agbabanye nʼAdulam.

16Kpachaanụ isi unu nʼọnọdụ iru ụjụ

nʼihi ụmụntakịrị ndị ahụ ihe ha masịrị unu,

meenụ ka isi unu kwọchaa dịka isi udele,

nʼihi na a ga-achụpụ ha site nʼebe unu nọ gaa mba ọzọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help