Ilu Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ihe dị nʼakwụkwọ a bụ okwu ndụmọdụ dị iche iche nke na-enye aka ibi ezi ndụ. Akwụkwọ a na-akọwa na amamihe dị ụzọ abụọ; amamihe nke Chineke na-enye mmadụ, na amamihe nke mmadụ nwere nʼihi okike e kere ya dị ka mmadụ. Ụdị amamihe abụọ ndị a dị mkpa na ndụ onye ọbụla. Okwu ndụmọdụ a chịkọtara nʼakwụkwọ Ilu a metụtara ịzụ ụmụntakịrị, ikpe ikpe ziri ezi, okwu nzuzu dị iche iche, na ịkpaezi agwa nʼọnọdụ dị iche iche. Ihe e ji mechie akwụkwọ a bụ ndụmọdụ metụtara onye bụ ezigbo nwanyị.Usoro e si dee ya:Nkọwa mmalite 1:1-7Ndụmọdụ gbasara ụmụntakịrị na ndị nwe ha 1:8–9:18Nchịkọta okwu amamihe Solomọn nke mbụ 10:1–22:16Okwu amamihe ndị ọzọ kwuru 22:17–24:34Nchịkọta okwu amamihe Solomọn nke abụọ 25–29Okwu amamihe Agọ na Lemuel 30:1–31:9Ezigbo nwanyị 31:10-31