Abụ nke Abụ 8 - Igbo Contemporary Bible 2020

1O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke;

nke otu nne mụrụ mụ na ya

m gaara esutu gị ọnụ

mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ

ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya.

2Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m,

ka ị nọdụ nʼebe ahụ,

nʼụlọ onye ziri m ihe.

Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ,

mmanya ụtọ nke pomegranet.

3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,

aka nri ya na-ejikụ m.

4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,

unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta

tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.

Ndị Enyi

5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,

onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya.

Onye a hụrụ nʼanya

Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;

nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;

nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.

6Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,

dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị

nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,

ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.

Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,

dịka ọkụ nke dị ukwu.

7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,

osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.

Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye

akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,

a ga-eleda ya anya nke ukwuu.

Ndị Enyi

8Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta

ma ọ kpụbeghị ara.

Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,

nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?

9Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,

anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;

ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,

anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.

Onye a hụrụ nʼanya

10Abụ m mgbidi,

ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.

Otu a ka m siri dị nʼanya ya

dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju.

11Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,

o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.

Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta

puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.

12Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye.

Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn,

ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

13Gị onye bi nʼubi a gbara ogige,

gị na ndị enyi gị,

kwere ka m nụ olu gị.

Onye a hụrụ nʼanya

14Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya,

bịakwute m dịka mgbada,

maọbụ dịka nwa ele

na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help