Abụ Ọma 93 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 93Ịdị ukwuu nke Onyenwe anyị

1 Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe;

Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu;

nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.

2Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie;

ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị.

3Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị;

oke osimiri niile eweliela olu ha elu;

ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.

4 Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu

karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme,

ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.

5Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike;

ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma

ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help