Abụ Ọma 149 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 149Abụ otuto

1Toonu Onyenwe anyị!

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.

Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.

2Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;

ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha.

3Ka ha jiri ite egwu too aha ya

ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.

4Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.

5Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,

bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.

6Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,

ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,

7iji bọọrọ mba niile ọbọ

taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,

8iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha

na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,

9imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.

Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.

Toonu Onyenwe anyị.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help