Aịzaya 16 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye

nye onye na-achị ala ahụ

site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara

ruo ugwu nke Ada Zayọn.

2Ndị inyom Moab

nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn

na-akwụgharị

dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.

3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”

“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.

Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị

nʼetiti oke ehihie.

Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,

ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.

4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,

ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”

Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,

mbibi ga-akwụsịkwa,

onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.

5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;

otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,

otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,

bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,

na-emekwa ngwa ime ezi omume.

6Anyị anụla akụkọ banyere Moab,

nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile.

Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi?

Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.

7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa,

ha na-ebetara Moab akwa.

Kwasie akwa ike, nwee mwute,

nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.

8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;

osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.

E, ndị eze mba dị iche iche azọdala

ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.

E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,

ruokwa nʼọzara,

nke mgbọrọgwụ ha gbasara

ruo nʼọnụ osimiri.

9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa

nʼihi ubi vaịnị Sibma.

Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ

gị Heshbọn, na gị Eleale,

nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada

mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.

10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma,

ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige;

ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya;

nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.

11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara,

ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.

12Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu,

ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya,

mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya,

o nweghị uru nke a ga-abara ha.

13Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ,

14ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help