Abụ Ọma 103 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 103Abụ Ọma Devid.Gọzie Onyenwe anyị

1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.

2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

echefukwala mmeso ọma ya niile,

3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile;

na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,

4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu

werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,

5onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile,

ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.

6 Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume,

na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.

7O mere ka Mosis mata ụzọ ya,

mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:

8 Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.

Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.

9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;

10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị,

ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.

11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,

otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.

12Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ,

otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.

13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,

otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,

14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị,

ọ na-echeta na anyị bụ aja.

15Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa,

ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,

16ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa,

adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.

17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site

nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya.

Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,

18nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya

na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.

19 Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe,

alaeze ya na-achị ihe niile.

20Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya,

unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ,

na-erubere okwu ya isi.

21Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile;

unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.

22Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile

nʼebe ọbụla ọ na-achị.

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help