Job Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ajụjụ a jụrụ nʼakwụkwọ a bụ nke a: Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ onye pụrụ ime ihe niile gịnị mere mmehie na nhụju anya ji dịrị nʼụwa? Gịnịkwa mere Chineke ji gba nkịtị ghara ime ihe ọbụla? Ụzọ e si zaa ajụjụ a bụ site nʼịkọ akụkọ ihe ndakwasị dị iche iche dakwasịrị Job. E gosiri ụdị nghọta nke ndị enyi Job nwere banyere ihe dakwasịrị Job. Nʼikpeazụ, Onyenwe anyị nʼonwe ya gwara Job okwu, nke nyeere ya aka ịghọta na ọrụ dịrị mmadụ abụghị ịghọtazu ihe mgbagwoju anya niile dị nʼụwa, kama ọ bụ mmadụ ịmata Onye Chineke bụ, na ijedesi ihe ahụ ọ maara banyere Chineke aka ike. Ihe e ji mechie akwụkwọ a bụ akụkọ otu Chineke si nyeghachi Job ihe ndị ahụ niile funarịrị ya.Usoro e si dee ya:Nhụju anya Job 1–2

Okwu ndị enyi Job kwuru na nzaghachi Job 3–31

Okwu Elihu kwuru 32–37

Ihe Onyenwe anyị gwara Job 38–41

Ọnọdụ ikpeazụ Job 42

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help