Abụ Ọma 55 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 55Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid.Ekpere nke onye enyi ya ghọrọ ya aghụghọ

1O Chineke, nụrụ ekpere m,

agbakwala arịrịọ m nkịtị;

2ṅaa m ntị, zaakwa m.

Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude

3nʼihi ihe onye iro m na-ekwu,

nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ,

nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ,

na-akpagbu m nʼiwe ha.

4Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;

oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.

5Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;

oke egwu ekpuchiela m.

6Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru!

Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.

7Agaara m efelaga ebe dị anya,

ga nọrọ nʼọzara; Sela

8Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m,

ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.”

9O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu,

nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.

10Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya;

iro na mmegbu dị nʼime ya.

11A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo;

ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.

12A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị,

apụrụ m ịnagide ya;

a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m,

apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.

13Maọbụ gị, nwoke dịka m,

onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,

14onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ,

nʼụlọ Chineke,

ka anyị na-ejegharị

nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.

15Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede;

ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ,

nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha.

16Ma akpọkuru m Chineke,

Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.

17Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị,

ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya

ma ọ na-anụkwa olu m.

18Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,

site nʼagha niile e busoro m,

nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.

19Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,

onye na-adịghị agbanwe,

ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ,

nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela

20Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,

ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.

21Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta,

ma ibu agha juru ya obi;

okwu ya niile dị nro karịa mmanụ,

ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.

22Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,

ọ ga-agba gị ume;

ọ gaghị ekwe

ka ewezuga onye ezi omume.

23Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume

nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure;

ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ

agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha.

Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help