Aịzaya 23 - Igbo Contemporary Bible 2020

Amụma e buru banyere Taịa

1Nke a bụ amụma megide Taịa:

Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish

nʼihi na e bibiela Taịa,

ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata.

Ozi erutela ha aka

site nʼobodo Saiprọs.

2Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu.

Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn,

ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa.

3Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu,

ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa,

owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa,

ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.

4Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri,

nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu;

“Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa;

o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”

5Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt,

ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.

6Gabiganụ ruo Tashish

tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.

7Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile?

Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga?

Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ

ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?

8Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa,

bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze,

mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze,

nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?

9Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya,

nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile,

na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.

10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl,

unu ụmụada Tashish,

nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.

11 Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri

mee ka alaeze ha niile maa jijiji.

O nyela iwu banyere Fonisia

ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.

12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ,

gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu.

“Bilie, gafee garuo Saiprọs,

ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”

13Lee anya nʼala ndị Kaldịa,

ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ!

Ndị Asịrịa mere ya

ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara.

Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu

tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike,

mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.

14Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri,

nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.

15A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a:

16“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo,

gị nwanyị akwụna e chefuru echefu;

kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ,

ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”

17E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile.

18Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help