Maika 3 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ịba mba nye ndịisi na ndị amụma

1Mgbe ahụ ekwuru m sị,

“Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb,

na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel.

Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi

2unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya.

Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ

na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.

3Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m,

na-agba ha akpụkpọ,

na-etijisi ọkpụkpụ ha,

na-egburi anụ ahụ ha,

dịka anụ a na-esinye nʼite.”

4Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị,

ma ọ gaghị aza ha!

Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ

nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.

5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:

“Banyere ndị amụma

bụ ndị na-eduhie ndị m,

mgbe ha nwere ihe ha ga-eri,

ha na-ekwusa ‘Udo’

ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri,

ha na-ebili buo agha megide onye dị otu a.

6Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ;

ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla.

Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ,

ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.

7Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme,

ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ.

Ha ga-ekpuchi ihu ha,

nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”

8Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike,

ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị,

jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi,

na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya,

na nye Izrel mmehie ya.

9Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb,

na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel.

Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị,

ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.

10Ndị ji ọbara wuo Zayọn,

werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.

11Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị,

ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ,

ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego.

Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị,

“Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị?

O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”

12Ọ bụ nʼihi gị

ka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi,

Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ,

ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help