1 Timoti 4 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ndụmọdụ e nyere Timoti

1Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ.

2Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha.

3Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha.

4Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya,

5nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.

6Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro.

7Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke.

8Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu.

9Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma.

10Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe.

Ndụmọdụ

11Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha.

12Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.

13Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke.

14Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi.

15Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma.

16Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help