1 Onyenwe anyị bụ eze,
ka mba niile maa jijiji!
O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim,
ka elu ụwa maa jijiji.
2 Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn;
ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche.
3Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu,
ọ dị nsọ.
4Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya,
i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike;
nʼime Jekọb ka i mere
ihe ziri ezi na ihe dị mma.
5Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu,
feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya;
ọ dị nsọ.
6Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya,
Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya;
ha kpọkuru Onyenwe anyị
ọ zakwara ha.
7Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii.
Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.
8O Onyenwe anyị, Chineke anyị,
ị zara ha;
ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie,
nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.
9Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu;
na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ,
nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.