1 Jọn Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Nke a bụ akwụkwọ Jọn dere nʼoge o mere agadi. O degaara ya ndị kweere na Kraịst gwa ha na ndị na-amaghị Kraịst amaghị Chineke bụ Nna. Ndị dị otu a adịghịkwa aghọta ụdị ịhụnanya Chineke nwere nʼebe ha nọ. Ọ kọwara na Chineke bụ ịhụnanya, na ịhụnanya Chineke na-apụtakwa ihe na ndụ ndị nwere Kraịst. Ndị nabatara ịhụnanya Chineke nye onwe ha ekwesikwaghị ịtụ egwu ihe ọbụla nʼụwa a maọbụ nʼụwa ọzọ.Usoro e si dee ya:Nnwekọ Chineke na onye Kraịst 1:1–2:2Iwu maka ịhụnanya 2:3-17Ịdọ aka na ntị banyere ndị na-emegide Kraịst 2:18-29Ibi ndụ onye Kraịst 3Ndị ozizi ụgha 4:1-6Ịhụnanya Chineke 4:7-21Mmeri nke ya na okwukwe so 5