Nehum 2 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ninive ga-ada

1Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị.

Chee ebe gị niile e wusiri ike nche.

Chee ụzọ niile nche,

mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala.

Chịkọtakwa ike gị niile.

2 Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi,

dịka ịma mma nke Izrel

ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha,

lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.

3Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara,

ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie.

Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma

nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha,

otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.

4Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi,

ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile.

Ha na-enwu dịka ire ọkụ,

na-agbagharịkwa dịka amụma.

5Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi,

ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha.

Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha,

dozie ọta nche ha niile nʼusoro.

6Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri,

ụlọeze na-amakwa jijiji.

7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a

aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha.

Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru,

na-etikwa aka nʼobi.

8Ninive dịka ọdọ mmiri

nke mmiri ya na-ehifusị.

“Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe,

ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.

9Kwakọrọnụ ọlaọcha,

kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha.

Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ,

enweghị ọgwụgwụ.

10E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.

Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji,

anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.

11Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a,

bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri,

ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị,

na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?

12Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya,

nke na-anyagburu nne ọdụm anụ,

na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile.

Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.

13“Edoola m onwe m imegide gị,”

otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri,

“Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ,

mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi.

Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa.

A gaghị anụkwa

olu ndị ozi gị ọzọ.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help