Ilu 10 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ ilu Solomọn

1Ilu dị iche iche nke Solomọn:

Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ;

ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.

2Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,

ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.

3 Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,

ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.

4Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,

ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.

5Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,

ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.

6Onye ezi omume na-anata ngọzị,

ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.

7Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị,

ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.

8Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,

ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.

9Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,

ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.

10Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute,

onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.

11Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ,

ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.

12Ịkpọ asị na-akpali esemokwu,

ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.

13Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,

ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.

14Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,

ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.

15Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,

ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.

16Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,

ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.

17Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,

ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.

18Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị

na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.

19Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị

ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.

20Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma,

ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.

21Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,

ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.

22Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,

ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.

23Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;

ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.

24Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,

ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.

25Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;

ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.

26Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya;

ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.

27Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ,

ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.

28Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ;

olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.

29Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta,

maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.

30A pụghị iwezuga onye ezi omume,

ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.

31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa,

ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.

32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,

ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help