Abụ Ọma 12 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 12Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma nke Devid.Ekpere maka enyemaka nʼoge ihe egwu

1 Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla!

Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ.

2O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya.

Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ,

maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.

3Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ

na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.

4Ndị na-asị,

“Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri;

egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?”

5“Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude,

aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru.

Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.”

6Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke,

ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ,

nke a nụchara ugboro asaa.

7O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo

ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.

8Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile

mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help