Ilu 9 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ọkpụkpọ oku nke amamihe na nzuzu

1Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya

nʼelu ogidi asaa.

2O doziela oriri ya nʼusoro,

o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.

3O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile,

site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,

4“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche”

Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị,

5“Bịanụ, rie nri m,

ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.

6Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ;

gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”

7Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị;

onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.

8Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị;

baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.

9Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa,

kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.

10Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,

inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.

11Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo.

A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.

12Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru,

ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.

13Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ,

o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.

14Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya,

nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,

15na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku,

bụ ndị na-aga mkpa ha,

16“Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.”

Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche,

17“Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ,

nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.”

18Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ,

na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help