Job 15 - Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu Elifaz

1Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:

2“Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi?

Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?

3Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka,

maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?

4Ma ị na-eleda ezi omume anya

na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.

5Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa;

ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.

6Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m,

egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.

7“Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ?

A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?

8Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke?

Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?

9Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị?

Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?

10Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị,

ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.

11Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta,

ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?

12Gịnị mere obi gị ji duhie gị,

gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,

13nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke,

meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?

14“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi,

gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?

15Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi,

ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,

16ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi,

bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.

17“Gee m ntị ka m kọwaara gị;

kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,

18bụ ihe ndị amamihe kwuru,

ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,

19bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha

mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.

20Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ,

bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.

21Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị,

mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.

22O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị;

mma agha nọ na-echere ya.

23Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele;

ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.

24Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu,

nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.

25Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu,

dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.

26O ji ikwesi olu ike,

dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.

27“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya,

abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,

28ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi,

nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha,

ụlọ nke na-adakasị adakasị.

29Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa.

Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.

30Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị,

ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ,

iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.

31Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu,

nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.

32Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju,

ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ

33Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha,

dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.

34Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga,

ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.

35Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume;

naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help