Abụ Ọma 30 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 30Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ.Abụ mgbapụta

1Aga m eto gị, O Onyenwe anyị,

nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m.

I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.

2O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka,

ị gwọkwara m.

3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m,

i mere ka m dịrị ndụ.

4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya,

toonu aha nsọ ya.

5Iwe ya adịghị adịgide tee anya,

ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!

Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,

ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.

6Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m,

“Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.”

7O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma,

i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu;

ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ,

adara m mba.

8Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru;

ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,

9“Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi?

Uru gịnị dị ma m rịda nʼili?

Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto?

Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?”

10O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere;

O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.

11I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu;

ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.

12I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ.

O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help