Abụ Ọma 120 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 120Abụ nrigo.Ekpere maka nnapụta

1Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m,

ọ na-azakwa m.

2O Onyenwe anyị, zọpụta m

site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha

na ire na-ekwu okwu aghụghọ.

3Gịnị ka a ga-eme gị,

ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị,

gị ire aghụghọ?

4Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ,

ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.

5Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek,

nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!

6Ogologo oge

ka m binyere ndị kpọrọ udo asị.

7Abụ m onye udo;

ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help