Jeremaya 31 - Igbo Contemporary Bible 2020

1“Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.”

2Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Ndị ahụ gbanarịrị mma agha

ga-ahụta ihuọma nʼọzara.

Aga m abịa iwetara Izrel izuike.”

3 Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,

“Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya;

Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.

4Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,

e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.

Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ

soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.

5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige

nʼelu ugwu Sameria.

Ndị ọrụ ubi kụrụ ya

ga-erikwa mkpụrụ si na ya.

6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ

nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,

‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,

ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”

7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,

tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.

Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,

‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,

bụ ndị Izrel fọdụrụ.’

8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;

aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.

Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,

na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.

Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!

9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,

ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.

Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,

nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,

nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,

Ifrem bụkwa ọkpara m.

10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;

kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.

Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.

Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.

11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,

ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.

12Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,

ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha,

dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,

na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi.

Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile;

ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.

13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,

ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ.

Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ,

aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.

14Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta,

afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,”

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

15Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,

“A nụrụ otu olu na Rema,

iru ụjụ na oke ịkwa akwa.

Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya,

o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya,

nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”

16Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa,

jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri,

nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

“Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.

17Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

“Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.

18“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị,

‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike.

Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị.

Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa,

nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.

19Mgbe m kpafuru,

echegharịrị m.

Mgbe m ghọtakwara,

e tiri m aka nʼobi m,

ihere mere m, ọ wutekwara m

nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’

20Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,

onye ihe ya na-atọ m ụtọ?

Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya,

ma anọkwa m na-echeta ya.

Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike.

Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

21“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,

manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.

Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,

bụ okporoụzọ unu ga-eso.

Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,

laghachi nʼobodo gị ndị a.

22Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,

gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel?

Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa;

nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.”

23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’

24Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha.

25Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”

26Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.

27Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.

28Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

29“Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,

“ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha,

ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’

30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.

31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,

“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị

nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,

nakwa ụlọ Juda.

32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ

mụ na nna nna ha gbara,

mgbe ahụ m jidere ha nʼaka

site nʼala Ijipt dupụta ha,

nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,

ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,”

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba

mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.

“Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,

aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.

Aga m abụ Chineke ha,

ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,

maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’

nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,

site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,

agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”

35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ

mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,

onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu

ka ha na-enye ihe nʼanyasị,

onye na-akpali oke osimiri,

na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.

Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

36Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,

“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,

ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,

ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”

37Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe,

na ịdị omimi nke ntọala ụwa,

ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel,

nʼihi ihe niile ha mere.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

38“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ.

39Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa.

40Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help