Job 7 - Igbo Contemporary Bible 2020

1“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba?

Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?

2Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada,

maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,

3otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya,

nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.

4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’

Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.

5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ;

anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.

6“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa,

ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.

7O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume;

anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.

8Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ;

unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.

9Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa,

otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.

10E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ;

ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.

11“Ya mere agaghị m emechi ọnụ;

aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ.

Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.

12A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri,

nke mere i ji eche m nche?

13Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi,

maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,

14nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu

werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,

15ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ,

karịa inwe ụdị ahụ m nke a.

16Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi.

Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.

17“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe,

i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,

18i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile,

ma na-anwale ya mgbe mgbe?

19Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ,

maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?

20Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị,

gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme?

Gịnị mere i ji elekwasị m anya?

Abụrụla m ibu arọ nye gị?

21Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m,

ma bupụ mmehie m?

Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ.

Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help