1 Samuel Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ Samuel nke mbụ na nke abụọ bụ otu akwụkwọ, nʼihi na ọ bụ akwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge Samuel, na Sọl, na Devid. E kewara ha ụzọ abụọ ime ka ha dị mfe ịgụ agụ. E ji akụkọ mkpagbu nke ndị Filistia na-akpagbu ndị Izrel malite akwụkwọ Samuel nke mbụ. Emesịa, a kọrọ akụkọ gbasara Samuel onye amụma, na Sọl eze mbụ nke ndị Izrel. A kọrọ akụkọ gbasara agha niile Sọl buru, na mmeri niile o meriri ndị iro ya. A kọkwara akụkọ banyere nnupu isi Sọl, na otu o si nwụọ. Nʼikpeazụ a kọrọ akụkọ banyere nhọpụta a họpụtara Devid ịbụ eze ndị Izrel.Usoro e si dee ya:Mmalite ọrụ Samuel na ibu agha ndị Filistia 1–7

Agha Sọl lụrụ na mmeri ya 8–15

Ọjụjụ Chineke jụrụ Sọl na nhọpụta Devid 16–20

Sọl akpagbuo Devid 21–24

Ịdị ukwuu nke Devid na ọnwụ Sọl 25–31

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help