Abụ Ọma 121 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 121Abụ nrigo.Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ

1Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,

olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?

2Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,

onye kere eluigwe na ụwa bịa.

3Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,

onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;

4nʼezie onye na-eche Izrel nche

adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.

5 Onyenwe anyị na-eche gị nche,

Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị;

6anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie,

ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.

7 Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.

Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.

8 Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,

site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help