Abụ Ọma 139 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 139Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.Chineke maara ihe niile

1O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,

ị makwaara m nke ọma

2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;

site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.

3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;

ị mazukwara ụzọ m niile.

4O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu

tupu m kwuo ya.

5Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ,

ị tụkwasịla m aka gị.

6Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m,

ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.

7Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị?

Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?

8Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ.

Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ.

9Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa

nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,

10ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m

aka nri gị ga-ejidesi m ike.

11Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m

ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”

12Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ;

abalị ga-enye ìhè dịka ehihie,

nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.

13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.

Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;

ọrụ gị niile dị ebube;

amaara m nke a nke ọma.

15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ

mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,

mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.

E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị

tupu otu nʼime ha adịrị.

17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!

Leekwa ka ha si dị ukwuu.

18Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ,

ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala.

Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.

19O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi!

Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!

20Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị;

ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.

21O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị,

na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?

22Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ?

Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.

23O Chineke, nyochaa m, mara obi m.

Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.

24Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m,

ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help