Ezra Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ Ezra kọrọ akụkọ gbasara nlọta ndị Juda site na Babilọn. Onye dere akwụkwọ a buru ụzọ kọọ otu ndị bu ụzọ lọta si lọta, kọọkwa otu e si malite iwugharị ụlọnsọ ukwu, na nsogbu bịakwasịrị ha. Ọ bụ ezie na ha nwere nsogbu dị ukwuu, ma ha mesiri wugharịa ụlọnsọ ukwu ahụ, doo ya nsọ nye maka ife Chineke ofufe. Ọrụ dị iche iche nke Ezra rụrụ, ya na ekpere o kpere nʼihi njehie ndị ahụ lọtara alọta ka e depụtara nʼakwụkwọ.Usoro e si dee ya:Nlọta mbụ nke ndị a dọtara nʼagha 1–2Iwugharị ụlọnsọ ukwu 3Nkwụsị a kwụsịrị ọrụ iwugharị ụlọnsọ ukwu 4Ido ụlọnsọ ukwu nsọ 5–6Ọrụ dị iche iche Ezra rụrụ 7–10