Abụ Ọma 125 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 125Abụ nrigo.Chineke onye na-echebe ndị ya

1Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn

nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

2Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu,

otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu

ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.

3Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide

nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza,

nʼihi na ndị ezi omume nwere ike

itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.

4O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma,

ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.

5Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ

na ndị niile na-eme ajọ ihe.

Ka udo dịrị Izrel.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help