Job 36 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Elihu gara nʼihu sị:

2“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị

na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.

3Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya;

aga m enye Onye kere m ezi omume.

4Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha;

onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.

5“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;

ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.

6Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,

kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.

7Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ,

kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze,

bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.

8Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,

jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,

9ọ na-agwa ha ihe ha mere,

na ha sitere na nganga ha mehie.

10Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,

na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.

11Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,

ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba,

biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.

12Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,

ha ga-ala nʼiyi site na mma agha,

ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.

13“Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha.

Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.

14Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha,

nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.

15Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha;

na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.

16“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu,

baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị,

baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.

17Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị;

ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.

18Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị;

ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.

19Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị

ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?

20Anọla na-echere ka abalị bịa,

mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.

21Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe,

bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.

22“E buliela Chineke elu nʼike ya,

onye bụ onye ozizi dịka ya?

23Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso,

maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?

24Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu,

bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.

25Mmadụ niile ahụzuola ya;

ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.

26Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị.

Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.

27“Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha,

nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.

28Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya

mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.

29Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii,

ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?

30Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya

na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.

31Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile

na-enyejukwa ha nri afọ.

32O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya,

ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.

33Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri;

ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help