Abụ Ọma 128 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 128Abụ nrigo.Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị

1Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,

ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.

2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;

ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.

3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị

na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;

ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv

gburugburu tebul gị.

4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ

na-atụ egwu Onyenwe anyị.

5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn

ụbọchị niile nke ndụ gị;

ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,

6ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị.

Ka udo dịrị Izrel.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help