Job 9 - Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu Job

1Job zara sị:

2“Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.

Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?

3Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,

ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?

4Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,

onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?

5Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,

na-akwatụ ha nʼiwe ya.

6Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,

mee ka ogidi ya maa jijiji.

7Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;

ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.

8Naanị ya gbasara mbara eluigwe,

ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.

9Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion

na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.

10Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,

ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.

11Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,

mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.

12Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?

Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’

13Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,

ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.

14“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,

maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?

15Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;

kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.

16A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,

ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.

17Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,

meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.

18Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi

kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.

19Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!

Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.

20A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;

ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.

21“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị

ejighị m onwe m kpọrọ ihe;

nʼezie ana m eleda ndụ m anya.

22Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,

‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’

23Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,

ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.

24Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,

ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya.

Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?

25“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;

ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.

26Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,

dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.

27Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,

aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’

28Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu

nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.

29Ebe m bụrịị onye ikpe mara,

nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?

30A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m

werekwa soda saa aka m abụọ,

31ị ga-enuba m nʼolulu apịtị

nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.

32“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,

ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.

33A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,

onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,

34onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,

ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.

35Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;

ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help